Abụ Ọma 132
Abụ nrigo. 
Devid na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị 
 1 O Onyenwe anyị, cheta Devid, 
nʼihe niile bụ ndị ọ gbakụtara azụ. 
 2 Ọ ṅụrụ iyi nye Onyenwe anyị, 
kwee nkwa nye Onye dị ukwuu nke Jekọb: 
 3 “Agaghị m abanye nʼime ụlọ m 
maọbụ rigoo nʼihe ndina m, 
 4 agaghị m arahụ ụra, 
egbugbere anya m agaghị atụ oru ụra, 
 5 tutu ruo mgbe m chọtaara Onyenwe anyị ọnọdụ 
ebe obibi nye Onye dị ukwuu nke Jekọb.” 
 6 Anyị nụrụ ihe banyere ya nʼEfrata, 
anyị chọtara ya nʼubi niile nke Jearim. 
 7 “Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; 
ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya. 
 8 ‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, 
gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị. 
 9 Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; 
ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ” 
 10 Nʼihi ohu gị, bụ Devid, 
agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ. 
 11  Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, 
bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: 
“Otu nʼime ụmụ gị, 
ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị, 
 12 ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m 
na ụkpụrụ niile m kuziri ha, 
mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala 
nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.” 
 13 Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, 
ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya; 
 14 “Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, 
ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ. 
 15 Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; 
aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya. 
 16 Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, 
ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ. 
 17 “Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi* 132:17 Nʼebe a mpi na-egosi ịdị ike puputara Devid 
ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ. 
 18 Aga m eyikwasị ndị iro ya ihere dịka uwe 
ma aga eji okpueze mara mma chọọ isi ya mma.”