Abụ Ọma 131
Abụ nrigo, nke Devid. 
Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi 
 1 O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m, 
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m; 
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m 
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m. 
 2 Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ; 
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ, 
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m. 
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.