Abụ Ọma 133
Abụ nrigo, nke Devid. 
Ngọzị nke ibi nʼotu 
 1 Lee ka o si bụrụ ihe dị mma 
na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!* 133:1  Hib 13:1 
 2 Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi, 
nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ, 
e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn, 
ruokwa nʼolu uwe mwụda ya. 
 3 Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon 
na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn. 
Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya, 
ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.