Abụ Ọma 128
Abụ nrigo. 
Ngọzị dịrị ndị na-atụ egwu Onyenwe anyị 
 1 Ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị, 
ndị na-aga ije nʼirube isi nye ya. 
 2 Ị ga-eri mkpụrụ ọrụ aka gị; 
ọtụtụ ngọzị na ihe ịga nke ọma ga-abụ nke gị. 
 3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị 
na-amị mkpụrụ nʼime ụlọ gị; 
ụmụ gị ndị ikom ga-adịkwa ka ome osisi oliv 
gburugburu tebul gị. 
 4 Otu a ka a ga-esi gọzie nwoke ahụ 
na-atụ egwu Onyenwe anyị. 
 5 Ka Onyenwe anyị gọzie gị site na Zayọn 
ụbọchị niile nke ndụ gị; 
ka i hụkwa ọdịmma Jerusalem, 
 6 ka ị dị ndụ hụ ụmụ ụmụ gị. 
Ka udo dịrị Izrel.* 128:6  Abụ 125:5