Abụ Ọma 129
Abụ nrigo. 
Ekpere megide ndị iro Izrel 
 1 Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, 
ka Izrel kwuo. 
 2 “Site na mgbe m bụ nwantakịrị, ha kpagburu m ọtụtụ oge, 
ma ha enweghị ike merie m. 
 3 Ndị ikom na-akọ ubi akọgharịala azụ m dịka ala ubi, 
mee ebe ha kọrọ akọ ka ọ dị ogologo. 
 4 Ma Onyenwe anyị bụ onye ezi omume; 
ọ tọpụla m site nʼagbụ niile nke ndị ajọ omume.” 
 5 Ka ndị niile kpọrọ Zayọn asị 
bụrụ ndị ga-alaghachi azụ nʼihere. 
 6 Ka ha niile dịrị ka ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ 
 7 nke onye na-ewe ihe ubi na-adịghị eji ha kpojuo aka ya abụọ, 
maọbụ onye mkpokọta e nwee ike kpojuo aka ya. 
 8 Ka ndị si nʼụzọ na-agafe hapụ ị sị ha, 
“Ngọzị Onyenwe anyị dịrị unu. 
Anyị na-agọzi unu nʼaha Onyenwe anyị.”† 129:8  Rut 2:4 
*Abụ Ọma 129:6 129:6 Ọ bụ ụrọ a gwakọtara ntụ na aja ka e ji emechi elu ụlọ nʼIzrel. Nʼoge mmiri ozuzo, ahịhịa na-epu nʼelu ụlọ ndị a nʼihi na ha dị larịị, ma ha adịghị adịgide. Mgbe ọkọchị bịara, nʼihi na mgbọrọgwụ ha abanyeghị nʼime aja elu ụlọ ndị a, ha na-akpọnwụ Abụ 37:2
†Abụ Ọma 129:8 129:8 Rut 2:4