Abụ Ọma 127
Abụ nrigo, nke Solomọn. 
Chineke dị mkpa 
 1 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ewughị ụlọ, 
ndị na-ewu ya na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. 
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị echeghị obodo, 
nʼefu ka ndị nche na-amụ anya. 
 2 Ọ bụ nʼefu ka ị na-ebili nʼisi ụtụtụ 
na-adọgbu onwe gị nʼọrụ 
ịchọta ihe ị ga-eri ruo nʼabalị, 
nʼihi na ọ na-eme ka ndị niile ọ hụrụ nʼanya hie ụra nʼudo. 
 3 Ụmụntakịrị bụ ihe nketa si nʼaka Onyenwe anyị, 
ụmụntakịrị bụ ụgwọ ọrụ ọ na-enye. 
 4 Dịka àkụ nʼaka dike nʼagha, 
otu a, ka ụmụ a mụtaara na mgbe okorobịa dị. 
 5 Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ 
onye kpojuru àkụ ndị a nʼakpa àkụ ya. 
Ihere agaghị eme ha mgbe ha na ndị iro 
na-arụrịta ụka nʼama.