Abụ Ọma 126
Abụ nrigo. 
Abụ ekele maka mgbapụta 
anyị dị ka ndị na-arọ nrọ. 
 2 Ọchị juru anyị ọnụ, 
abụ ọṅụ jukwara anyị ire. 
Mgbe ahụ, e kwukwara ya na mba niile sị, 
“Onyenwe anyị emeerela ha ọtụtụ ihe dị ukwuu.” 
 3  Onyenwe anyị emeerala anyị ọtụtụ ihe dị ukwuu, 
obi anyị jupụtakwara nʼọṅụ. 
 4 Nyeghachi anyị akụnụba anyị, o Onyenwe anyị, 
dịka mmiri iyi na-asọ nʼala Negev. 
 5 Ndị niile na-eji anya mmiri na-arụ ọrụ ịkụ mkpụrụ 
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ wee ihe ubi ahụ. 
 6 Onye ji ịkwa akwa 
buru mkpụrụ ubi ọ ga-agha na-aga, 
ga-emesịa jiri abụ ọṅụ na-alọghachi azụ, 
mgbe ha bu ukwu ọka ha.