Abụ Ọma 125
Abụ nrigo. 
Chineke onye na-echebe ndị ya 
 1 Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn 
nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi. 
 2 Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu, 
otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu 
ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi. 
 3 Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide* 125:3  Aịz 14:5 
nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza, 
nʼihi na ndị ezi omume nwere ike 
itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ. 
 4 O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma, 
ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi. 
 5 Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ 
na ndị niile na-eme ajọ ihe. 
Ka udo dịrị Izrel.