Abụ Ọma 122
Abụ nrigo, nke Devid. 
Ekpere maka udo Jerusalem 
 1 Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha sị m, 
“Ka anyị gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.”* 122:1  Aịz 2:3; Mai 4:2; Zek 8:21 
 2 Ụkwụ anyị eguzola ugbu a 
nʼọnụ ụzọ ama gị niile, gị obodo Jerusalem. 
 3 E wuru Jerusalem dịka obodo 
a chịkọtara ọnụ nke ọma. 
 4 Ọ bụ ebe ahụ ka ebo niile na-arịgo, 
bụ ebo niile nke Onyenwe anyị, 
ịbụku aha Onyenwe anyị abụ 
dịka iwu o nyere ndị Izrel si dị. 
 5 Nʼebe ahụ ka ocheeze niile nke ikpe ikpe dị, 
bụ ocheeze niile nke ezinaụlọ Devid. 
 6 Kpeenụ ekpere maka udo Jerusalem: 
“Ka ndị niile hụrụ gị nʼanya nọọ nʼudo. 
 7 Ka udo dịrị nʼime mgbidi gị niile 
nchekwa dịrịkwa nʼime ebe nche gị niile e wusiri ike.” 
 8 Nʼihi ụmụnne m na ndị enyi m, 
ana m ekwu okwu sị, “Udo dịrị gị.” 
 9 Nʼihi ụlọ Onyenwe anyị, Chineke anyị, 
aga m achọ ọganihu gị.