Abụ Ọma 121
Abụ nrigo. 
Inyeaka si nʼebe Onyenwe anyị nọ 
 1 Aga m eweli anya m abụọ elu, lee ha nʼelu ugwu niile, 
olee ebe inyeaka ga-esi bịara m? 
onye kere eluigwe na ụwa bịa. 
 3 Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, 
onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; 
 4 nʼezie onye na-eche Izrel nche 
adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. 
 5  Onyenwe anyị na-eche gị nche, 
Onyenwe anyị bụ ndo† 121:5  Aịz 25:4 gị nʼaka nri gị; 
 6 anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, 
ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. 
 7  Onyenwe anyị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. 
Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. 
 8  Onyenwe anyị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, 
site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.