Abụ Ọma 123
Abụ nrigo. 
Ekpere maka ebere 
 1 Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị, 
gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe. 
 2 Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya, 
na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,* 123:2 Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime. 
otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya, 
ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere. 
 3 Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere, 
nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha. 
 4 Nʼihi na nnagide anyị na-anagide 
ịchị ọchị ndị nganga, 
na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu. 
*Abụ Ọma 123:2 123:2 Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.