Abụ Ọma 118
Kelee Onyenwe anyị 
 1 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma; 
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 2 Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, 
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 
 3 Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, 
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 
 4 Ka ndị niile na-atụ egwu Onyenwe anyị kwuo sị, 
“Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” 
 5 Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, 
ọ zara m, mee ka m nwere onwe m. 
 6  Onyenwe anyị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. 
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? 
 7  Onyenwe anyị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. 
Aga m ele ndị iro m anya na mmeri. 
 8 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị 
karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. 
 9 Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime Onyenwe anyị 
karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi. 
 10 Mba niile gbara m gburugburu 
ma site nʼaha Onyenwe anyị aga m ala ha nʼiyi. 
 11 Ha gbara m gburugburu, 
ma site nʼaha Onyenwe anyị ka m na-egbuda ha. 
 12 Ha gbara m gburugburu dịka aṅụ, 
ma e menyụọla ha dịka ogwu na-ere ọkụ; 
site nʼaha Onyenwe anyị, ka m na-egbuda ha. 
 13 Akwaghachiri m azụ, agaara m ada, 
ma Onyenwe anyị nyere m aka. 
 14  Onyenwe anyị bụ ike m na abụ m; 
ọ ghọọla nzọpụta m. 
 15 Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri 
na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: 
“Aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! 
 16 Aka nri Onyenwe anyị bụ ihe e weliri elu; 
aka nri Onyenwe anyị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” 
 17 Agaghị m anwụ, 
kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube Onyenwe anyị rụrụ. 
 18  Onyenwe anyị tara m ahụhụ nke ukwuu, 
ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. 
 19 Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; 
aga m abanye nye Onyenwe anyị ekele. 
 20 Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ Onyenwe anyị, 
ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. 
 21 Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; 
ị ghọọla nzọpụta m. 
 22 Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, 
aghọọla nkume isi ntọala* 118:22 Ya bụ, isi nkuku ụlọ ụlọ; 
 23 nke a bụ ọrụ aka Onyenwe anyị, 
ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. 
 24 Nke a bụ ụbọchị Onyenwe anyị anyị mere, 
ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya. 
 25 O Onyenwe anyị, zọpụta anyị; 
o Onyenwe anyị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma. 
 26 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha Onyenwe anyị. 
Anyị sitere nʼụlọ Onyenwe anyị na-agọzi gị. 
 27  Onyenwe anyị bụ Chineke, 
ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. 
Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke 
bịaruo nʼebe ịchụ aja. 
 28 Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; 
ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu. 
 29 Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma, 
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.