Abụ Ọma 119
א Alef 
 1 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, 
ndị na-ejegharị dịka iwu Onyenwe anyị si dị. 
 2 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya 
ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. 
 3 Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; 
ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. 
 4 I doola ụkpụrụ 
ndị a ga-erubekwara isi. 
 5 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike 
na-erube isi nye iwu gị niile! 
 6 Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m 
mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. 
 7 Aga m eji obi ziri ezi too gị 
dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. 
 8 Aga m erubere iwu gị niile isi; 
biko ahapụkwala m. 
ב Bet 
 9 Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? 
Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. 
 10 Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. 
Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. 
 11 Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, 
igbochi m imehie imegide gị. 
 12 Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; 
kuziere m iwu gị niile. 
 13 Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa 
iwu niile nke si nʼọnụ gị. 
 14 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile 
dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. 
 15 Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị 
na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. 
 16 Iwu gị na-amasị m; 
agaghị m elefu okwu gị anya. 
ג Gimel 
 17 Meere ohu gị ihe ọma, ka m nwe ike dị ndụ; 
aga m erubere okwu gị isi. 
 18 Kpughee anya m abụọ 
ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị. 
 19 Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; 
ezonarịla m iwu gị niile. 
 20 Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile 
na-agụ mkpụrụobi m agụụ. 
 21 Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ 
na ndị na-anaghị agbaso iwu gị. 
 22 Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, 
nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile. 
 23 Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, 
ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị. 
 24 Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; 
ha bụ ndị ndụmọdụ m. 
ד Dalet 
 25 Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; 
kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị. 
 26 Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; 
ugbu a, kuziere m iwu gị. 
 27 Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; 
ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile. 
 28 Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; 
gbaa m ume dịka okwu gị si dị. 
 29 Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; 
site nʼiwu gị meere m amara. 
 30 Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; 
e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile. 
 31 O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; 
ekwela ka ihere mee m. 
 32 Aga m agbaso iwu gị niile 
nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya. 
ה He 
 33 O Onyenwe anyị, zi m ụzọ m ga-esi gbasoo iwu gị niile; 
mgbe ahụ, aga m edebe ha ruo nʼọgwụgwụ. 
 34 Nye m nghọta, aga m edebe iwu gị 
ma jiri obi m niile rubere ya isi. 
 35 Duo m nʼụzọ nke iwu gị niile, 
nʼihi na ọ bụ nʼime ha ka m na-achọta obi ụtọ. 
 36 Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile 
ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe. 
 37 Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; 
chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.* 119:37 Mee ka m dị ndụ nʼụzọ gị 
 38 Mezuo nkwa i kwere ohu gị, 
ka a tụọ egwu gị. 
 39 Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, 
nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 
 40 Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! 
Chebe ndụ m site nʼezi omume gị. 
ו Waw 
 41 O Onyenwe anyị, ka ịhụnanya gị nke na-adịgide bịakwasị m, 
nzọpụta gị dịka nkwa i kwere si dị; 
 42 mgbe ahụ, aga m azaghachi onye ahụ na-achị m ọchị, 
nʼihi na ana m atụkwasị obi m nʼokwu gị. 
 43 Esitela nʼọnụ m napụ okwu nke eziokwu, 
nʼihi na olileanya m dị nʼiwu gị niile. 
 44 Aga m anọgide na-erubere iwu gị isi 
ruo mgbe ebighị ebi. 
 45 Aga m ejegharị nʼọnọdụ inwere onwe 
nʼihi na achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 
 46 Aga m ekwupụta banyere ụkpụrụ gị nʼihu ndị eze 
ma ihere agaghị eme m, 
 47 nʼihi na iwu gị na-amasị m 
nʼihi na ahụrụ m ha nʼanya. 
 48 Ana m eweliri iwu gị niile aka elu, bụ ndị m hụrụ nʼanya, 
ana m atụgharịkwa uche nʼiwu gị niile. 
ז Zayin 
 49 Cheta okwu i nyere ohu gị, 
nʼihi na i nyela m olileanya. 
 50 Nkasiobi m nʼime ịta ahụhụ m bụ nke a: 
nkwa gị na-echebe ndụ m. 
 51 Ndị mpako na-akwa m emo na-esepụghị aka, 
ma anaghị m esite nʼiwu gị wezuga onwe m. 
 52 O Onyenwe anyị, ana m echeta iwu gị niile, ndị dị site na mgbe ochie, 
ha na-ewetara m nkasiobi. 
 53 Ana m ewe iwe nke ukwu nʼihi ndị ajọ omume, 
ndị gbakụtara iwu gị azụ. 
 54 Iwu gị niile bụ isi okwu abụ m 
ebe ọbụla m na-anọ. 
 55 Nʼabalị, o Onyenwe anyị, ana m echeta aha gị, 
aga m edebekwa iwu gị. 
 56 Nke a bụrịị ihe m na-eme oge niile: 
ana m erubere ụkpụrụ gị isi. 
ח Het 
 57 O Onyenwe anyị, ị bụ ihe nketa m; 
ekweela m nkwa irube isi nye okwu gị niile. 
 58 Ejirila m obi m niile chọọ ihu gị; 
meere m ebere dịka nkwa gị si dị. 
 59 Echeela m echiche banyere ụzọ m niile, 
chigharịakwa na-agbaso ụkpụrụ gị niile. 
 60 Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge 
irubere iwu gị niile isi. 
 61 A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, 
agaghị m echefu iwu gị. 
 62 Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele 
nʼihi iwu gị niile ziri ezi.† 119:62  Ọrụ 16:25 
 63 Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, 
ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị. 
 64 O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; 
kuziere m iwu gị niile. 
ט Tet 
 65 Meere ohu gị ihe ọma 
dịka okwu gị si dị, o Onyenwe anyị. 
 66 Zi m ihe ọmụma na ikpe ziri ezi 
nʼihi na ekwenyere m nʼiwu gị niile. 
 67 Tupu m nwee nsogbu, a kpafuru m, 
ma ugbu a, ana m erubere okwu gị isi. 
 68 I dị mma, ihe i na-eme ziri ezi; 
kuziere m iwu gị niile. 
 69 Nʼagbanyeghị na ndị mpako a gbasaala okwu ụgha techie m, 
ana m eji obi m niile na-edebe ụkpụrụ gị. 
 70 Obi ha siri ike, ọ dịghị ihe na-emetụta ha, 
ma ana m enwe mmasị nʼiwu gị. 
 71 Ọ dị mma na m tara ahụhụ 
ka m nwee ike mụta iwu gị niile. 
 72 Iwu si nʼọnụ gị pụta dị oke ọnụahịa nye m 
karịa imerime puku ọlaọcha na ọlaedo. 
י Yod 
 73 Aka gị kere m, kpụọkwa m; 
nye m nghọta ka m mụta iwu gị niile. 
 74 Ka ndị na-atụ egwu gị ṅụrịa mgbe ha hụrụ m, 
nʼihi na olileanya m dị nʼokwu gị. 
 75 O Onyenwe anyị, amaara m na iwu gị niile ziri ezi, 
ọ bụkwa nʼikwesị ntụkwasị obi ka ị tara m ahụhụ. 
 76 Ka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ kasịe m obi, 
dịka nkwa i kwere ohu gị si dị. 
 77 Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, 
nʼihi na iwu gị na-amasị m. 
 78 Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; 
ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 
 79 Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, 
ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile. 
 80 Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, 
ka ihere ghara ime m. 
כ Kap 
 81 Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, 
ma olileanya m dị nʼokwu gị. 
 82 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nkwa gị; 
ana m asị, “Olee mgbe ị ga-akasị m obi?” 
 83 Nʼagbanyeghị na adị m ka karama akpụkpọ‡ 119:83 Ọ bụ ihe eji agbanye mmanya, nʼelu ekwu isi nri a kwanyere ọkụ ka a na-ekonye karama akpụkpọ anụ a gbanyere mmanye ọhụrụ. Nke a bụ iji mee ka mmanya ahụ nwee ike gbaa ụka ọsịịsọ. Nʼihi na-edebere ya nʼọkụ, akpụkpọ anụ ahụ na-akpọ nku, taa ahụ, dị ochie, bụrụkwa ihe na-abaghị uru ọzọ na ihe a na-atụfu atụfu. nke dị nʼanwụrụ ọkụ, 
anaghị m echefu iwu gị niile. 
 84 Ruo olee mgbe ka ohu gị ga-anọgide na-eche? 
Olee mgbe ka ị ga-ata ndị na-akpagbu m ahụhụ? 
 85 Ndị mpako na-egwuru m olulu, 
bụ ihe nke na-adịghị ka iwu gị si dị. 
 86 Iwu gị niile kwesiri ntụkwasị obi; 
nyere m aka, nʼihi na ndị mmadụ na-akpagbu m ma o nweghị ihe m mere ha. 
 87 Ọ fọdụrụ ntakịrị ihe, ha gaara ala m nʼiyi, 
ma agbakụtaghị m ụkpụrụ gị azụ. 
 88 Site nʼịhụnanya gị nke na-adịgide chebe ndụ m, 
ka m nwe ike rube isi nʼiwu nke ọnụ gị. 
ל Lamed 
ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe. 
 90 Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; 
ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike. 
 91 Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, 
nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi. 
 92 A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, 
agaara m anwụ nʼime nsogbu m. 
 93 Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, 
nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m. 
 94 Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; 
achọpụtala m ụkpụrụ gị niile. 
 95 Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, 
ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị. 
 96 Ana m ahụ nsọtụ ihe niile zuruoke, 
ma iwu gị niile enweghị nsọtụ. 
מ Mem 
 97 O, otu m si hụ iwu gị nʼanya! 
Ana m atụgharị uche na ya ogologo ụbọchị niile. 
 98 Iwu gị na-eme ka amamihe m karịa nke ndị iro m, 
ha na-anọnyere m oge niile. 
 99 Enwere m nghọta karịa ndị na-ezi m ihe, 
nʼihi na ana m atụgharịa uche nʼiwu gị niile. 
 100 Enwere m nghọta karịa ndị okenye 
nʼihi na ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi. 
 101 Ajụrụ m ajụ ije ije nʼụzọ ọjọọ ọbụla 
ka m nwee ike rubere okwu gị isi 
 102 Ewezugaghị m onwe m nʼiwu gị niile, 
nʼihi na ọ bụ gị onwe gị ziri m ha. 
 103 Lee ka okwu gị niile si atọ m ụtọ, 
ha dị ụtọ nʼọnụ m karịa mmanụ aṅụ! 
 104 A na-enweta nghọta site nʼụkpụrụ gị niile; 
ya mere ana m akpọ ụzọ ọjọọ ọbụla asị. 
נ Nun 
 105 Okwu gị bụ oriọna dịrị ụkwụ m 
bụrụkwa ìhè nʼụzọ m. 
 106 Aṅụọla m iyi, mee ka o guzosie ike, 
na aga m agbaso iwu ezi omume gị niile. 
 107 Ataala m ahụhụ nke ukwuu; 
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka okwu gị si dị. 
 108 O Onyenwe anyị, nabata otuto afọ ofufu niile nke si nʼọnụ m, 
kuziekwara m iwu gị niile. 
 109 Mkpụrụobi m na-adị m nʼọbụaka m oge niile, 
ma echezọghị m iwu gị. 
 110 Ndị ajọ omume esielera m ọnya, 
ma esitebeghị m nʼụkpụrụ gị kpafuo. 
 111 Iwu gị niile bụ ihe nketa m ruo mgbe ebighị ebi; 
ha bụ ihe na-enye obi m ọṅụ. 
 112 Obi m ekpebiela idebe ụkpụrụ gị 
ruo na ngwụcha. 
ס Samek 
 113 Ana m akpọ ndị na-enwe obi abụọ asị, 
ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 
 114 Ị bụ ebe mgbaba m na ọta m; 
olileanya m dị nʼokwu gị. 
 115 Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-eme ihe ọjọọ, 
ka m nwee ike idebe iwu niile nke Chineke m! 
 116 Gbaa m ume dịka nkwa gị si dị, aga m adịkwa ndụ; 
ekwekwala ka olileanya m daa. 
 117 Kwagide m, aga m abụ onye a gbapụtara; 
aga m anọgide na-asọpụrụ iwu gị niile. 
 118 Ị na-ajụ ndị niile na-adịghị edebe iwu gị, 
nzube aghụghọ ha niile bụ ihe na-enweghị isi. 
 119 Ị na-ekpochapụ ndị ajọ omume dịka unyi a na-ekpofu ekpofu; 
nʼihi ya, ahụrụ m ụkpụrụ gị niile nʼanya. 
 120 Anụ ahụ m na-ama jijiji nʼihi ịtụ egwu gị; 
ana m eguzo nʼoke egwu nʼihi iwu gị niile. 
ע Ayin 
 121 Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; 
ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m. 
 122 Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; 
ekwela ka ndị mpako kpagbuo m. 
 123 Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị 
ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi. 
 124 Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị 
ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile. 
 125 Abụ m ohu gị, nye m nghọta, 
ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile. 
 126 O Onyenwe anyị, oge eruola mgbe ị ga-arụ ọrụ, 
nʼihi na a na-emebi iwu gị. 
 127 Nʼihi na ahụrụ m iwu gị niile nʼanya 
karịa ọlaedo, e karịa ọlaedo a nụchara anụcha, 
 128 nʼihi na m na-ahụta ụkpụrụ gị niile ka ihe ziri ezi, 
akpọrọ m ụzọ niile na-ezighị ezi asị. 
פ Pe 
 129 Iwu gị niile dị ịtụnanya; 
ya mere, ana m erubere ha isi. 
 130 Mkpughepụ na nkọwa nke okwu gị na-enye ìhè; 
ọ na-eme ka ndị na-enweghị uche ghọta ihe. 
 131 Ana m asaghe ọnụ m na-ekupụ ume ike ike, 
na-achọsi iwu gị niile ike. 
 132 Chee m ihu, meere m ebere, 
dịka i si emere ndị niile hụrụ aha gị nʼanya ebere. 
 133 Mee ka nzọ ụkwụ m niile na-aga dịka okwu gị si dị; 
ekwela ka mmehie chịa m. 
 134 Gbapụta m site nʼaka ndị na-emegbu m, 
ka m nwee ike debe iwu gị. 
 135 Mee ka ihuọma gị dịkwasị nʼahụ ohu gị. 
Kuziere m ụkpụrụ gị niile. 
 136 Anya mmiri akwa na-agba m nke ukwuu 
nʼihi na ndị mmadụ adịghị erube isi nye iwu gị. 
צ Tsade 
 137 O Onyenwe anyị, ị bụ onye ezi omume, 
iwu gị niile zikwara ezi. 
 138 Ụkpụrụ gị niile ziri ezi; 
ha kwesiri ntụkwasị obi. 
 139 Nʼihi na ndị iro m na-elefu okwu gị anya, 
ịnụ ọkụ nʼobi m na-ada mba. 
 140 Nkwa gị niile bụ ihe enyochara nke ọma, 
ohu gị na-ahụkwa ha nʼanya. 
 141 Ọ bụ ezie na m bụ onye dị ala, na onye a na-eleda anya, 
ma adịghị m eleda ụkpụrụ gị niile anya. 
 142 Ezi omume gị na-adị ruo mgbe ebighị ebi. 
Iwu gị niile bụkwa eziokwu. 
 143 Nsogbu na ihe mgbu adakwasịla m, 
ma iwu gị niile bụ ihe na-amasị m. 
 144 Iwu gị niile bụ ezi omume ruo mgbe ebighị ebi; 
nye m nghọta, ka m nwe ike dị ndụ. 
ק Kwof 
 145 Eji m obi m niile na-akpọ oku; zaa m o Onyenwe anyị, 
aga m erubekwa isi nye ụkpụrụ gị niile. 
 146 Ana m akpọku gị; zọpụta m 
aga m erube isi nye ụkpụrụ gị niile. 
 147 Tupu chị na-abọ, ana m ebili, na-akwa akwa maka enyemaka; 
olileanya m dị nʼokwu gị. 
 148 Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, 
nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile. 
 149 Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; 
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị. 
 150 Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso 
ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya. 
 151 Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; 
ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu. 
 152 Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, 
na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi. 
ר Resh 
 153 Ledata anya ka ị hụ ịta ahụhụ m ma gbapụta m, 
nʼihi na echefughị m iwu gị. 
 154 Kpepụta m, gbapụta m, 
chebe ndụ m dịka nkwa gị si dị. 
 155 Nzọpụta dị anya nʼebe ndị na-eme ihe ọjọọ nọ, 
nʼihi na ha anaghị agbaso ụkpụrụ gị niile. 
 156 O Onyenwe anyị, ọmịiko gị dị ukwuu; 
chebe ndụ m dịka iwu gị niile si dị. 
 157 Ndị iro m na ndị na-akpagbu m dị ọtụtụ, 
ma aga m anọgide na-edebe iwu gị. 
 158 Ana m asọ ndị niile na-enweghị okwukwe nʼime gị oyi, 
nʼihi na ha anaghị erubere okwu gị isi. 
 159 Lee ka m si hụ ụkpụrụ gị niile nʼanya; 
chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka ịhụnanya gị si dị. 
 160 Okwu gị niile bụ eziokwu; 
iwu gị niile ziri ezi na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
ש Sin na Shin 
 161 Ndịisi na-emegbu m na-enweghị ihe m mere, 
ma obi m na-ama jijiji nʼihi okwu gị. 
 162 Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị 
dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 
 163 Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, 
ma ahụrụ m iwu gị nʼanya. 
 164 Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, 
nʼihi iwu gị ziri ezi. 
 165 Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, 
ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ. 
 166 Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, 
na-agbasokwa iwu gị niile. 
 167 Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi 
nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu. 
 168 Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, 
nʼihi na ị maara ụzọ m niile. 
ת Taw 
 169 Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; 
nye m nghọta dịka okwu gị si dị. 
 170 Ka arịrịọ m ruo gị ntị; 
gbapụta m dịka nkwa gị si dị. 
 171 Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, 
nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile. 
 172 Ka m jiri ire m bụọ abụ banyere okwu gị, 
nʼihi na iwu gị niile ziri ezi. 
 173 Nọọ na njikere oge niile inyere m aka, 
nʼihi na ahọrọla m ụkpụrụ gị niile. 
 174 Ana m ele anya nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, 
iwu gị bụ ihe na-amasị m. 
 175 Kwere ka m dịrị ndụ ka m nwee ike ito gị, 
ka iwu gị niile gbaa m ume. 
 176 Akpafuola m dịka atụrụ nke furu efu, 
chọọ ohu gị, 
nʼihi na echefubeghị m iwu gị niile. 
*Abụ Ọma 119:37 119:37 Mee ka m dị ndụ nʼụzọ gị
†Abụ Ọma 119:62 119:62 Ọrụ 16:25
‡Abụ Ọma 119:83 119:83 Ọ bụ ihe eji agbanye mmanya, nʼelu ekwu isi nri a kwanyere ọkụ ka a na-ekonye karama akpụkpọ anụ a gbanyere mmanye ọhụrụ. Nke a bụ iji mee ka mmanya ahụ nwee ike gbaa ụka ọsịịsọ. Nʼihi na-edebere ya nʼọkụ, akpụkpọ anụ ahụ na-akpọ nku, taa ahụ, dị ochie, bụrụkwa ihe na-abaghị uru ọzọ na ihe a na-atụfu atụfu.
§Abụ Ọma 119:89 119:89 Aịz 40:8; Mat 24:35; 1Pt 1:25