Abụ Ọma 117
Too ya nʼihi ịhụnanya ya 
 1 Toonu Onyenwe anyị, unu mba niile dị iche iche. 
Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche. 
 2 Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu. 
Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi. 
Toonu Onyenwe anyị!