Abụ Ọma 98
Abụ Ọma. 
Toonu Onyenwe anyị onye ezi omume 
nʼihi na ọ rụọla ọtụtụ ọrụ dị ebube; 
aka nri ya na aka nsọ ya 
arụpụtarala ya nzọpụta. 
 2  Onyenwe anyị emeela ka a mata nzọpụta ya 
o kpugheela ezi omume ya nye mba niile. 
 3 O chetala ịhụnanya ya 
na ikwesi ntụkwasị obi ya nʼebe ụlọ Izrel dị; 
nsọtụ nke ụwa niile ahụla 
nzọpụta Chineke anyị. 
 4 Tikusienụ Onyenwe anyị mkpu ọṅụ ike, ụwa niile 
jirinụ iti egwu tiwaa mkpu abụ ọṅụ; 
 5 werenụ ụbọ akwara bụkuo Onyenwe anyị abụ, 
e, were ụbọ akwara na olu abụ ọma, 
 6 jirinụ opi na opi ike, 
tisie mkpu ọṅụ ike nʼihu Onyenwe anyị, Onye bụ Eze. 
 7 Ka oke osimiri niile gbọọ ụja, ya na ihe niile dị nʼime ya, 
ụwa na ndị niile bi nʼime ya. 
 8 Ka osimiri na iyi niile kụọ aka ha, 
ka ugwu niile bụkuokwa ya abụ nʼihi ọṅụ; 
 9 ka ha bụọ abụ nʼihu Onyenwe anyị, 
nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe. 
Ọ ga-eji ezi omume kpee ụwa ikpe. 
Ọ ga-eji ikpe ziri ezi kpee ndị niile ikpe.