Abụ Ọma 97
Chineke onye na-achị ihe niile 
ka ndị niile bi nʼebe dị anya ṅụrịa. 
 2 Igwe ojii na oke ọchịchịrị gbara ya gburugburu; 
ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala ocheeze ya. 
 3 Ọkụ na-enwu enwu na-aga nʼihu ya 
ọ na-erepịasị ndị iro ya nʼakụkụ ya ọbụla. 
 4 Amụma ya na-acha chazuo elu ụwa niile; 
ụwa niile na-ahụ ya na-ama jijiji. 
 5 Ugwu niile na-agbaze dịka mmanụ nʼihu Onyenwe anyị, 
nʼihu Onyenwe ụwa niile. 
 6 Eluigwe na-ekwuwapụta ezi omume ya; 
ndị niile bi nʼụwa na-ahụkwa ebube ya. 
 7 A na-eme ka ihere mee ndị niile na-efe arụsị niile a pịrị apị ofufe, 
ndị na-anya isi na chi niile e jiri aka mee 
feenụ ya ofufe, unu chi niile! 
 8 Zayọn na-anụ ma na-aṅụrịkwa ọṅụ, 
obodo nta niile nke Juda na-enwekwa obi ụtọ 
nʼihi ikpe gị, O Onyenwe anyị. 
 9 Nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, bụ Onye kachasị ihe niile elu nʼụwa niile; 
ị bụ onye e buliri elu karịa chi ndị ọzọ niile. 
 10 Ka unu, ndị hụrụ Onyenwe anyị nʼanya, kpọọ ihe ọjọọ asị, 
nʼihi na ọ na-echebe ndụ ndị nke ya, ndị tụkwasịrị ya obi 
ma na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ajọ omume. 
 11 Ìhè na-amụkwasị onye ezi omume, 
ọṅụ na-adịkwa nʼime obi onye na-eme ihe ziri ezi. 
 12 Ṅụrịanụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, unu ndị ezi omume, 
tookwanụ aha nsọ ya.