Abụ Ọma 99
Toonu Chineke dị nsọ 
 1  Onyenwe anyị bụ eze, 
ka mba niile maa jijiji! 
O wuru ocheeze ya nʼetiti cherubim, 
ka elu ụwa maa jijiji. 
 2  Onyenwe anyị dị ukwuu nʼime Zayọn; 
ọ bụ onye e buliri elu karịa mba niile dị iche iche. 
 3 Ka ha too aha gị nke dị ukwuu, dịkwa oke egwu, 
ọ dị nsọ. 
 4 Eze bụ onye dị ike, ọ hụrụ ikpe ziri ezi nʼanya, 
i meela ka ihe ziri ezi guzosie ike; 
nʼime Jekọb ka i mere 
ihe ziri ezi na ihe dị mma. 
 5 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu, 
feenụ ofufe nʼihu ebe ihe ịtụkwasị ụkwụ ya; 
ọ dị nsọ. 
 6 Mosis na Erọn so nʼetiti ndị nchụaja ya, 
Samuel sokwa nʼetiti ndị kpọkuru aha ya; 
ha kpọkuru Onyenwe anyị 
ọ zakwara ha. 
 7 Ọ gwara ha okwu site nʼogidi igwe ojii. 
Ha debere ụkpụrụ ya na iwu niile o nyere ha. 
 8 O Onyenwe anyị, Chineke anyị, 
ị zara ha; 
ị bụụrụ Izrel Chineke onye na-agbaghara mmehie, 
nʼagbanyeghị na ị tara ha ahụhụ nʼihi mmehie ha. 
 9 Bulienụ Onyenwe anyị Chineke anyị elu; 
na-efe ya ofufe nʼelu ugwu ya dị nsọ, 
nʼihi na onye dị nsọ ka Onyenwe anyị Chineke anyị bụ.