Abụ Ọma 80
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. 
Ekpere maka nnapụta 
 1 Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, 
gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. 
Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, 
nwupụta Ìhè  2 nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase.* 80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ. 
Kpọtee ịdị ike gị, 
bịa zọpụta anyị. 
 3 O Chineke, kpọghachi anyị azụ, 
mee ka ihu gị nwukwasị anyị, 
ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 
 4 O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile 
ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ 
megide ekpere ndị gị? 
 5 I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; 
i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ. 
 6 I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, 
ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị. 
 7 O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, 
mee ka ihu gị nwukwasị anyị, 
ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 
 8 I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; 
ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. 
 9 Ị sụchaara ya ala, 
mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile. 
 10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile, 
alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida. 
 11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri 
wasaakwa ume ya ruo osimiri.† 80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a. 
 12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile 
si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya? 
 13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, 
ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri. 
 14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. 
Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! 
Letakwa osisi vaịnị a, 
 15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, 
ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 
 16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; 
mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi. 
 17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, 
nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 
 18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; 
tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. 
 19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile 
mee ka ihu gị nwukwasị anyị, 
ka e nwee ike zọpụta anyị. 
*Abụ Ọma 80:2 80:2 Ebo atọ ndị a bụ ụmụ ụmụ Rechel, bụ ndị soo igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼazụ mgbe ndị Izrel na-ala nʼala nkwa ahụ.
†Abụ Ọma 80:11 80:11 Eleghị anya osimiri ndị a bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis. Nʼoge ọchịchị eze Devid na Solomọn, alaeze ha kwụsịrị nʼosimiri abụọ ndị a.