Abụ Ọma 81
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ nke Asaf nʼusoro gittit. 
Ịdị mma nke Chineke 
 1 Bụkuo Chineke bụ ike anyị abụ ọṅụ, 
tikusie Chineke Jekọb mkpu ike! 
 2 Bidonụ iti egwu, kụọ ihe iti egwu, 
kpọọnụ ụbọ akwara na-enye abụ ụtọ na une. 
 3 Fụọnụ opi ike nʼoge ọnwa ọhụrụ, 
na mgbe ọnwa gbapụtara nʼuju ya, nʼụbọchị mmemme anyị; 
 4 nke a bụ iwu dịrị Izrel, 
ụkpụrụ Chineke nke Jekọb. 
 5 O mere ka o guzosie ike dịka iwu nye Josef 
mgbe ọ pụrụ imegide Ijipt. 
Anụkwara m olu nʼasụsụ nke m na-amaghị, ka ọ na-asị: 
 6 “Ewezugala m ibu arọ site nʼubu ha; 
aka ha abụọ nwere onwe ha site nʼịrụ ọrụ. 
 7 Nʼime ihe mgbu unu, unu kpọrọ oku, anapụtara m unu, 
azara m unu site nʼegbe eluigwe; 
anwara m unu na mmiri nke Meriba. 
Sela
  8 “Nụrụnụ, ndị m, aga m adọ unu aka na ntị, 
a sịkwarị na unu ga-ege m ntị, unu ndị Izrel! 
 9 Unu agaghị enwe chi ndị mba ọzọ nʼetiti unu; 
unu agaghị akpọkwa isiala nye chi si ala ọzọ. 
 10 Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, 
onye kpọpụtara unu site nʼala Ijipt. 
Meghe ọnụ unu ka ọ saa mbara, aga m emeju ya. 
 11 “Ma ndị m ekweghị ige m ntị. 
Izrel emekwaghị dịka m gwara ha. 
 12 Ya mere, ahapụrụ m ha na ndụ isiike ha, 
ka ha soro nchepụta nke echiche ha. 
 13 “Ewoo, a sị na ndị m gaara ege m ntị, 
a sịkwa na Izrel ga-eso ụzọ m niile. 
 14 Ọ gaghị adị anya mgbe m ga-eji ike m, wezuga ndị iro ya site nʼọnọdụ ha. 
Aga m eweli aka m, megide ndị iro ya niile. 
 15 Ndị niile kpọrọ Onyenwe anyị asị, ga-ada nʼihu ya nʼụjọ. 
Ịta ahụhụ ha ga-adịgidekwa, ruo ebighị ebi. 
 16 Ma a ga-eji ụtụ ọka wiiti kachasị mma, nyejuo unu afọ; 
aga m ejikwa mmanụ aṅụ nke sitere nʼoke nkume, nyejuo unu afọ.”