Abụ Ọma 79
Abụ Ọma Asaf. 
Akwa nʼihi mbibi Jerusalem 
 1 O Chineke, mba dị iche iche abatala nʼihe nketa gị; 
ha emerụọla ụlọnsọ ukwuu gị, 
ha etikpọọla Jerusalem, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 
 2 Ha ewerela ozu ndị ohu gị nye anụ ufe niile nke eluigwe 
ka ọ bụrụ ihe oriri nye ha, 
werekwa ozu nke ndị nsọ gị nye anụ ọhịa niile nke ụwa. 
 3 Ha awụpụla ọbara dịka mmiri 
nʼakụkụ niile nke Jerusalem, 
ọ dịghị otu onye fọdụrụ nke ga-eli ndị nwụrụ anwụ. 
 4 Anyị aghọọla ihe ịta ụta nʼebe ndị agbataobi anyị nọ, 
ghọọkwara ndị gbara anyị gburugburu ihe ịchị ọchị, na ihe ịkwa emo. 
 5 O Onyenwe anyị, ruo olee mgbe? Ị ga-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi? 
Ruo olee mgbe ka ekworo gị ga na-ere dịka ọkụ? 
 6 Wụkwasị mba niile ndị na-amaghị gị 
dịka Chineke oke iwe gị, 
bụ alaeze niile ndị ahụ 
na-adịghị akpọku aha gị; 
 7 nʼihi na ha eripịala Jekọb 
mekwaa ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu. 
 8 Atala anyị ahụhụ mmehie nke nna nna anyị mere; 
ka ebere gị bịa ngwangwa zute anyị, 
nʼihi na anyị nọ nʼọnọdụ oke mkpa. 
 9 Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, 
nʼihi ebube nke aha gị; 
napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile 
nʼihi aha gị. 
 10 Gịnị mere ndị mba ọzọ ji na-ajụ ajụjụ sị, 
“Olee ebe Chineke ha nọ?” 
Nʼihu anyị, mee ka a mara nʼetiti ndị mba ọzọ, 
na ị na-abọ ọbọ ọbara ndị ohu gị niile a wufuru. 
 11 Gee ntị nʼịsụ ude nke ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ; 
site nʼike nke aka gị chebe ndị niile a mara ikpe ọnwụ. 
 12 Bọọ ọbọ ugboro asaa megide ndị agbataobi anyị 
nʼihi ụta ha tara gị, O Onyenwe anyị. 
 13 Mgbe ahụ, anyị bụ ndị gị, ụmụ igwe atụrụ gị 
ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi; 
anyị ga na-ekwupụta otuto gị, 
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.