Abụ Ọma 61
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid nke eji ụbọ akwara akpọ. 
Ekpere nke onye nọ na nsogbu 
 1 Nụrụ akwa m, O Chineke, 
gee ntị nʼekpere m. 
 2 Ana m akpọku gị site na nsọtụ nke ụwa, 
ana m akpọku gị mgbe obi m na-ada mba; 
duru m gaa nʼoke nkume ahụ nke karịrị m elu. 
 3 Nʼihi na ị bụrịị ebe mgbaba m, 
na ụlọ ahụ dịkarịrị elu, sie ike imegide onye iro ahụ.* 61:3  Ilu 18:10 
 4 Ọ na-agụ m ibi nʼụlọ ikwu gị ruo mgbe ebighị ebi, 
ka m gbaba, zere ndụ nʼokpuru nku gị abụọ. 
Sela
  5 Nʼihi na gị onwe gị, Chineke, anụla nkwa niile m kwere; 
i nyela m ihe nketa nke ndị na-atụ egwu aha gị. 
 6 Tụkwasị ọtụtụ ụbọchị na ndụ eze, 
mee ka afọ ya ruo ọtụtụ ọgbọ. 
 7 Kwere ka ọ nọrọ nʼocheeze nʼihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi; 
zidata ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị, ka ha na-echezikwa ya. 
 8 Mgbe ahụ, aga m abụ abụ otuto nye aha gị, ruo mgbe ebighị ebi. 
Aga m emezukwa nkwa m kwere gị ụbọchị niile.