Abụ Ọma 62
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. 
Ịnọgide nʼokwukwe 
 1 Ọ bụ naanị nʼime Chineke ka mkpụrụobi m na-achọta izuike. 
Nzọpụta m na-esite na ya na-abịa. 
 2 Naanị ya bụ oke nkume m na nzọpụta m; 
ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 
 3 Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ebuso agha megide nwoke a? 
Unu niile, unu chọrọ ịkwatu ya, 
ebe ọ bụ naanị mgbidi na-ada ada, mgbidi na-esighị ike e ji osisi wuo? 
 4 Ha ekpebiela 
isite nʼọnọdụ ya dị elu kwatuo ya; 
okwu ụgha na-atọ ha ụtọ. 
Ha na-eji ọnụ ha na-agọzi, 
ma nʼime obi ha, ha na-abụ ọnụ. 
Sela
  5 O mkpụrụobi m, chọta ezumike naanị nʼime Chineke; 
olileanya m na-esite na ya na-abịa. 
 6 Naanị ya bụ oke nkume m, na onye nzọpụta m. 
Naanị ya kwa bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, agaghị m ama jijiji nʼọnọdụ m. 
 7 Nzọpụta m na nsọpụrụ m dabeere na Chineke,* 62:7 Maọbụ, Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ nzọpụta m na ugwu m 
Ọ bụ oke nkume m, ebe mgbaba m. 
 8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile, unu ndị mmadụ; 
kwupụtaranụ ya obi unu, 
nʼihi na Chineke bụ ebe mgbaba anyị. 
Sela
  9 Ndị nta nʼetiti ụmụ mmadụ bụ naanị otu nkuume, 
ndị ukwu bụ naanị ụgha; 
ọ bụrụ na a tụọ ha nʼihe ọtụtụ, ha bụ ihe efu; 
ha niile bụ naanị otu nkuume. 
 10 Unu atụkwasịla obi unu nʼiji aka ike kpata ego, 
maọbụ tụkwasị olileanya unu nʼihe e zuru ezu; 
akụ unu nwere ike mụbaa, 
unu atụkwasịla ha obi. 
 11 Chineke ekwuola otu ihe, 
ihe abụọ ka m nụrụ: 
“Na gị, O Chineke, dị ike, 
 12 na gị, Onyenwe anyị, jupụtara nʼịhụnanya. 
Nʼezie, ị ga-akwụghachi onye ọbụla 
dịka ọrụ ya si dị.”