Abụ Ọma 60
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ.” Abụ miktam nke Devid maka izi ihe. Mgbe ọ lụsoro Aram Naharaim na Aram Zoba ọgụ, nakwa mgbe Joab lọghachitara, tigbuo narị ndị Edọm iri nʼabụọ na Ndagwurugwu Nnu. 
Ekpere maka nnapụta 
 1 O Chineke, ị jụla anyị, ị tịwawo anyị nʼike; 
i wesola anyị iwe, ugbu a, kpọghachi anyị. 
 2 I meela ka ala a maa jijiji, ị dọwakwala ya; 
mezie ntiwa ya niile, nʼihi na ọ na-ama jijiji. 
 3 I meela ka ndị gị gabiga ọnọdụ ihe isi ike; 
i nyela anyị mmanya nke mere ka anyị na-adagharị. 
 4 Ma nye ndị na-atụ egwu gị, i weliela otu ọkọlọtọ 
nke a ga-agbasa nʼihi eziokwu imegide ụta nke ndị iro. 
Sela
  5 Were aka nri gị zọpụta anyị ma nyere anyị aka, 
ka a gbapụta ndị ị hụrụ nʼanya. 
 6 Chineke esitela nʼịdị nsọ ya kwuo, sị, 
“Nʼọnọdụ ọṅụ nke mmeri, aga m ekesa Shekem,* 60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6 
tụkwaa Ndagwurugwu Sukọt nʼihe ọtụtụ nyepụ ya. 
 7 Gilead bụ nke m,† 60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32 otu a kwa, Manase bụkwa nke m;‡ 60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32 
Ifrem bụ okpu igwe m, 
Juda bụ mkpara eze m. 
 8 Moab bụ efere ịkwọ aka m, 
aga m atụsa akpụkpọụkwụ m nʼelu Edọm; 
nʼelu isi Filistia, ana m eti mkpu mmeri.” 
 9 Onye ga-akpọrọ m gaa nʼobodo e wusiri ike? 
Onye ga-edu m gaa Edọm? 
 10 Ọ bụghị gị, O Chineke? Gị onye jụrụ anyị, 
onye na-adịghị esokwa ndị agha anyị aga agha? 
 11 Nyere anyị aka ka anyị pụọ nʼaka ndị iro, 
nʼihi na inyeaka mmadụ bụ ihe efu. 
 12 Site na Chineke, anyị ga-enwe mmeri, 
ọ ga-azọpịa ndị iro anyị niile nʼala. 
*Abụ Ọma 60:6 60:6 Shekem bụ isi obodo ọchịchị mbụ ndị Izrel. Jen 12:6
†Abụ Ọma 60:7 60:7 Gilead, bụ ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32
‡Abụ Ọma 60:7 60:7 Manase, bụkwa ala ndị dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Jos 13:24-32