Abụ Ọma 59
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Devid. Abụ miktam nke eji olu abụ “E bibikwala,” abụ. Mgbe Sọl zipụrụ ndị ikom ka e chee ụlọ Devid nche nʼihi igbu ya. 
Ekpere maka nnapụta 
 1 O Chineke, site nʼaka ndị iro m gbapụta m, 
chebe m site nʼaka ndị na-ebili imegide m. 
 2 Gbapụta m site nʼaka ndị na-eme ajọ ihe, 
zọpụtakwa m site nʼaka ndị ogbu mmadụ. 
 3 Lee ka ha siri zoo onwe ha nʼihi ịnapụ m ndụ! 
Ndị na-eme ihe ike na-agba izu megide m, 
o Onyenwe anyị, ma ọ bụghị nʼihi ihe m mere maọbụ mmehie m. 
 4 Mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ m mere, ma lee ha dị njikere imegide m. 
Bilie, bịa nyere m aka; lee ihe ọjọọ dakwasịrị m! 
 5 Gị, Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, 
gị onye bụ Chineke nke Izrel, 
kpọtee onwe gị ịta mba niile dị iche iche ahụhụ; 
e gosikwala ndị na-ezube nzube ọjọọ obi ebere. 
Sela
  6 Nʼanyasị, ha na-alaghachi, 
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta 
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 
 7 Lee ihe ha si nʼọnụ ha na-aghụpụta, 
okwu si nʼọnụ ha na-agbụpụta dị nkọ dịka mma agha, 
ha na-asịkwa, “Onye pụrụ ịnụ ihe anyị na-ekwu?” 
 8 Ma gị Onyenwe anyị, na-achị ha ọchị; 
ị na-akwa mba ndị a niile emo. 
 9 O, gị onye bụ ike m, ana m ele anya gị; 
gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike. 
 10 Chineke m, onye m tụkwasịrị obi. 
Chineke ga-ebutere m ụzọ 
mekwaa ka m chịa ndị niile na-ekwulu m ọchị. 
 11 O Onyenwe anyị na ọta anyị, egbukwala ha, 
ma ọ bụghị ya, ndị m ga-echefu. 
Were ike gị mee ka ha wagharịa,* 59:11 Were ike gị hopu ha 
wedakwaa ha nʼala. 
 12 Ka e jide ha nʼime nganga ha, 
nʼihi mmehie si ha nʼọnụ na-apụta, 
na nʼihi okwu ọnụ ha. 
Nʼihi okwu ọbụbụ ọnụ ha na okwu ụgha ha, 
 13 jiri iwe ọkụ repịa ha, 
repịa ha ruo mgbe ha ga-aghọ ntụ. 
Mgbe ahụ, a ga-amata ruo na nsọtụ nke ụwa, 
na Chineke na-achị Jekọb. 
 14 Nʼanyasị ha na-alaghachi; 
na-eme mkpọtụ dịka ụmụ nkịta, 
mgbe ha na-akpagharị nʼime obodo. 
 15 Ha na-awagharị na-achọ nri, 
na-etikwa mkpu ma ọ bụrụ na afọ ejughị ha. 
 16 Ma aga m abụ abụ banyere ike gị, 
nʼụtụtụ aga m abụ abụ banyere ịhụnanya gị; 
ị bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, 
ebe mgbaba m nʼoge nsogbu. 
 17 O, gị onye bụ ike m, ana m abụku gị abụ otuto; 
gị, o Chineke, bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, 
Chineke m, onye m na-adabere.