Abụ Ọma 58
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala.” Abụ Devid. Abụ miktam. 
Ahụhụ nke ndị na-emebi iwu 
 1 Unu ndị na-achị achị, O nweela oge unu na-ekwu ihe ziri ezi? 
O nweela oge unu na-ekpe ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ? 
 2 Mba, nʼime obi unu, unu na-echepụta mmegbu, 
aka unu na-emepụta ihe ike nʼelu ụwa. 
 3 Ọ bụladị site nʼọmụmụ, ndị ajọ omume na-akpafu; 
site nʼime afọ, ha na-akpafu akpafu na-ekwusa okwu ụgha. 
 4 Ha na-agbọpụta nsi nʼọnụ ha dịka agwọ, 
na-emechi ntị ha dịka ajụala ntị chiri, 
 5 nke na-adịghị anụ olu onye mgbaasị na-akpọpụta ya, 
nʼagbanyeghị otu ǹka onye ahụ si dị. 
 6 O Chineke, tijie eze niile dị ha nʼọnụ; 
o Onyenwe anyị, dọpụta eze ọdụm ndị a! 
 7 Mee ka ha sọfuo dịka mmiri na-asọ asọ; 
mgbe ha na-eseti ụta ha, mee ka ọnụ àkụ ha gbajie. 
 8 Dịka ejula nke na-agbaze mgbe ọ na-aga nʼụzọ ya; 
dịka nwa nwụrụ nʼafọ nne ya, ka ha ghara ịhụ anyanwụ. 
 9 Tupu ite unu amata okpomọkụ nke osisi ogwu, 
ma ha dị ndụ, ma ha kpọnwụrụ akpọnwụ, a ga-azachapụ ndị ajọ omume. 
 10 Ndị ezi omume ga-enwe obi ụtọ mgbe a bọọrọ ha ọbọ, 
mgbe ha ga-asacha ụkwụ ha nʼime ọbara ndị ajọ omume. 
 11 Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ekwu sị, 
“Nʼezie, a na-akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ; 
nʼezie, e nwere Chineke onye na-ekpe ụwa ikpe.”