Abụ Ọma 55
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. 
Ekpere nke onye enyi ya ghọrọ ya aghụghọ 
 1 O Chineke, nụrụ ekpere m, 
agbakwala arịrịọ m nkịtị; 
 2 ṅaa m ntị, zaakwa m. 
Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude 
 3 nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, 
nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, 
nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, 
na-akpagbu m nʼiwe ha. 
 4 Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; 
oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m. 
 5 Ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji abịakwasịkwala m; 
oke egwu ekpuchiela m. 
 6 Agwara m onwe m okwu sị, “A sịkwarị na m nwere nku dịka nduru! 
Agaara m efelaga ebe ọzọ gaa zuru ike. 
 7 Agaara m efelaga ebe dị anya, 
ga nọrọ nʼọzara; 
Sela
  8 Agaara m eme ngwangwa gaa nʼebe mgbaba m, 
ebe dị anya site nʼebe ifufe siri ike na oke ifufe dị.” 
 9 O Onyenwe anyị, gbagwojuo ndị ajọ omume anya, mee ka ha ghara ịghọta ihe ibe ha na-ekwu, 
nʼihi na ana m ahụ ihe ike na ịlụ ọgụ nʼime obodo. 
 10 Ehihie na abalị, ha na-ejegharị nʼelu mgbidi ya; 
iro na mmegbu dị nʼime ya. 
 11 A na-ahụta akaọrụ ihe ịla nʼiyi nʼime obodo; 
ihe ike na ụgha ewerela ọnọdụ ha nʼime obodo. 
 12 A sị na ọ bụ onye iro ji m eme ihe ọchị, 
apụrụ m ịnagide ya; 
a sịkwa na ọ bụ onye iro na-eweli onwe ya megide m, 
apụrụ m izonarị onwe m site nʼebe ọ nọ. 
 13 Maọbụ gị, nwoke dịka m, 
onye mụ na ya dị na mma, enyi m ọma, 
 14 onye mụ na ya na-enwe mmekọrịta dị ụtọ na mbụ, 
nʼụlọ Chineke, 
ka anyị na-ejegharị 
nʼetiti ọha mmadụ bịara ife ofufe. 
 15 Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; 
ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, 
nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. 
 16 Ma akpọkuru m Chineke, 
Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m. 
 17 Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, 
ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya 
ma ọ na-anụkwa olu m. 
 18 Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, 
site nʼagha niile e busoro m, 
nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m. 
 19 Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, 
onye na-adịghị agbanwe, 
ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, 
nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. 
Sela
  20 Onye mụ na ya dị na mma na-emegide ndị enyi ya, 
ọ na-emerụ ọgbụgba ndụ ya ka ọ ghara ịdị nsọ. 
 21 Okwu ọnụ ya dị mụrụmụrụ* 55:21 Ya bụ, okwu ire ụtọ ka bọta, 
ma ibu agha juru ya obi; 
okwu ya niile dị nro karịa mmanụ, 
ma ha bụ mma agha e welitere maka ibu agha. 
 22 Tụkwasị Onyenwe anyị mkpa gị niile, 
ọ ga-agba gị ume; 
ọ gaghị ekwe 
ka ewezuga onye ezi omume. 
 23 Ma gị, O Chineke, ga-adọtu ndị ajọ omume 
nʼime olulu nke jupụtara nʼire ure; 
ndị ogbu mmadụ na ndị aghụghọ 
agaghị ebi ọ bụladị ọkara ndụ ha. 
Ma mụ onwe m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m.