Abụ Ọma 56
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Ọ bụ olu abụ “Nduru nọ nʼosisi Ook dị ebe dị anya.” Abụ nke Devid ka eji agụ ya. Abụ miktam. Mgbe ndị Filistia nọchibidoro ya nʼobodo Gat. 
Ekpere maka mgbapụta 
 1 O Chineke, meere m ebere, 
nʼihi na ndị mmadụ ji ike na-achụso m; 
ogologo ụbọchị niile, ha na-ebu agha imegide m. 
 2 Ogologo ụbọchị niile ndị iro m na-achụso m; 
site na nganga ha, ọtụtụ na-ebu agha megide m. 
 3 Ma mgbe ụjọ na-atụ m, ọ bụ na gị ka m na-atụkwasị obi m. 
 4 Nʼime Chineke onye m na-eto okwu ya, 
nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. 
Gịnị ka mmadụ efu pụrụ ime m? 
 5 Ogologo ụbọchị niile, ha na-asụgharị okwu m kwuru isi; 
oge niile ka ha na-atụ atụmatụ imerụ m ahụ. 
 6 Ha na-agba izu nzuzo na-ezokwa onwe ha, 
ha na-enyochapụta nzọ ụkwụ m niile, 
dịkwa njikere ịnapụ m ndụ m. 
 7 Nʼihi ajọ omume ha, ekwekwala ka ha gbapụ; 
o Chineke, nʼime iwe gị, wedaa mba ndị a niile dị iche iche nʼala. 
 8 Depụta akwa arịrị m; 
chekọtasịa anya mmiri akwa m niile nʼime karama gị. 
Ọ bụ na ha adịghị nʼakwụkwọ ndepụta gị? 
 9 Mgbe m ga-akpọku gị maka enyemaka, 
ndị iro m ga-agbaghachi azụ. 
Site nʼụzọ dị otu a, aga m amara na Chineke nọnyeere m. 
 10 Nʼime Chineke, onye m na-eto okwu ya, 
nʼime Onyenwe anyị, onye m na-eto okwu ya, 
 11 nʼime Chineke ka m na-atụkwasị obi; ụjọ agaghị atụ m. 
Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? 
 12 O Chineke m, nʼisi m ka nkwa niile m kwere gị dị; 
aga m ewetara gị onyinye ekele m niile. 
 13 Nʼihi na ị zọpụtala m site nʼọnwụ, 
ma napụta ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, 
ka m nwee ike jegharịa nʼihu Chineke, 
nʼìhè nke ndụ.