Abụ Ọma 54
Abụ Ọma Devid. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ maskil Devid. Mgbe ndị Zif gara sị Sọl, “Devid ọ dịghị ezo nʼetiti anyị?” 
Ekpere maka nchebe 
 1 O Chineke, jiri aha gị zọpụta m; 
jirikwa ike gị kpepụta m. 
 2 O Chineke, nụrụ ekpere m; 
gee ntị nʼokwu ọnụ m. 
 3 Ndị m na-amaghị na-ebuso m agha; 
ndị na-eme ihe ike na-achọ ịnapụ m ndụ m, 
ndị na-akpọghị Chineke ihe ọbụla. 
Sela
  4 Nʼezie, Chineke bụ onye inyeaka m; 
onyenwe m bụ onye na-agba m ume. 
 5 Mee ka ihe ọjọọ lọghachikwute ndị na-ekwulu m; 
nʼime ikwesi ntụkwasị obi gị, laa ha nʼiyi. 
 6 Aga m eji onyinye afọ ofufu chụọrọ gị aja; 
O Onyenwe anyị, aga m eto aha gị, nʼihi na ọ dị mma. 
 7 Nʼihi na ọ gbapụtala m site na nsogbu m niile, 
ọ bụ anya mmeri ka m ji na-ele ndị iro m anya.