Abụ Ọma 39
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ maka Jedutun. Abụ Ọma Devid. 
Nkwupụta mmehie 
 1 Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile 
ma debe ire m ka m ghara ikwuhie* 39:1  Job 2:10; Abụ 34:13; Jem 3:5-12; 
aga m eji ihe kechie ọnụ m 
mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.” 
 2 Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, 
jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, 
oke ihe mgbu m mụbara. 
 3 Obi m kporo ọkụ nʼime m, 
ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere; 
mgbe ahụ ekwuru m okwu sị: 
 4 “O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m 
na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile; 
mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa. 
 5 I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; 
ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. 
Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume 
ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. 
Sela
  6 “Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo 
nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ, 
na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ. 
 7 “Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya? 
Olileanya m dị nʼime gị. 
 8 Zọpụta m site na mmehie m niile; 
ekwela ka m bụrụ ihe ọchị nye ndị nzuzu. 
 9 Agbachiri m nkịtị, ajụrụ m ikwu okwu, 
nʼihi na ọ bụ gị mere ihe a. 
 10 Kwụsị iti m ihe; 
ihe otiti nke aka gị ezuola m ahụ. 
 11 Ị na-abara ndị mmadụ mba ma na-ata ha ahụhụ nʼihi mmehie ha; 
ị na-eripịa akụnụba ha dịka nla, 
mmadụ ọbụla bụ naanị otu nkuume. 
Sela
  12 “O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, 
gekwaa ntị nʼakwa m maka enyemaka; 
emechila ntị gị nye ibe akwa m. 
Nʼihi ana m ebinyere gị dịka onye ọbịa, 
dịka onye ije, dịka nna nna m ha mere. 
 13 Lepụ anya na-ebe m nọ, ka m nwee ike kporie ndụ ọzọ, 
tupu m hapụ ebe a laa, a gaghị ahụkwa m ọzọ.”