Abụ Ọma 38
Abụ Ọma Devid. Arịrịọ. 
Arịrịọ nʼoge nsogbu 
 1 Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, 
maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ. 
 2 Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, 
aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ. 
 3 Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; 
enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m. 
 4 Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m 
dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 
 5 Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi 
nʼihi mmehie enweghị uche m. 
 6 Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala 
ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ. 
 7 Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu 
ahụ adịghịkwa m. 
 8 Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. 
Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi. 
 9 O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; 
ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ. 
 10 Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, 
ìhè esitekwala nʼanya m pụọ. 
 11 Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, 
ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya. 
 12 Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, 
ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; 
ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ. 
 13 Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, 
dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 
 14 Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, 
onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 
 15 O Onyenwe anyị, ana m eche gị; 
o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 
 16 Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; 
maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 
 17 Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. 
Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu. 
 18 Ana m ekwupụta mmehie m; 
mmehie m na-ewute m. 
 19 Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ, 
ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba. 
 20 Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe, 
na-ebo ebubo megide m 
nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe. 
 21 O Onyenwe anyị, ahapụkwala m; 
O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya. 
 22 Bịa ọsịịsọ inyere m aka 
Onyenwe m na Onye nzọpụta m.