Abụ Ọma 40
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Abụ ekele 
 1 Eji m ndidi chere Onyenwe anyị, 
ọ tụgharịkwutere m, ọ nụkwaara akwa m. 
 2 O sitere nʼolulu na-amị amị, 
nke apịtị na ụrọ juru, sepụta m; 
o guzobere ụkwụ m abụọ nʼelu oke nkume, 
nyekwa m ebe siri ike ka m guzo. 
 3 O tinyere abụ ọhụrụ nʼọnụ m, 
abụ otuto nye Chineke anyị. 
Ọtụtụ ga-ahụ ya ma tụọ egwu, 
ha ga-atụkwasị obi ha nʼime Onyenwe anyị. 
 4 Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, 
onye na-eme Onyenwe anyị ebe ntụkwasị obi ya; 
onye na-adịghị ele ndị mpako anya 
maọbụ ndị na-atụgharị gbasoo arụsị.* 40:4 Maọbụ, gbasoo okwu ụgha 
 5 O Onyenwe anyị Chineke m, 
ọrụ ebube ị rụrụ dị ọtụtụ, 
ọ dịghị onye pụrụ ịgụkọta ihe niile 
ị kwadooro maka inye anyị; 
a sịkwarị na aga m ekwu ma kọsaa ihe banyere ha, 
ha karịrị ihe ọnụ pụrụ ikwu. 
 6 Aja na onyinye† 40:6  1Sa 15:22; Abụ 51:16-17; Aịz 1:11; Jer 7:22-23; Mai 6:6-8; Hib 10:5-9 abụghị ihe ị chọrọ 
ma ị megheela ntị abụọ; 
aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie abụghị ihe ị chọrọ. 
 7 Mgbe ahụ, ekwuru m sị, “Lee m, abịala m, 
e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta. 
 8 O Chineke m, ọ bụ ọchịchọ m ime ihe ị na-achọ, 
iwu gị dị nʼime obi m.” 
 9 Ana m anọ nʼetiti ọgbakọ ukwuu na-ekwusa ihe ziri ezi; 
dịka ị maara, o Onyenwe anyị, 
anaghị m emechi ọnụ m. 
 10 Ekpuchighị m ezi omume gị nʼime obi m, 
ana m ekwupụta maka ikwesi ntụkwasị obi gị na nzọpụta gị. 
Adịghị m ekpuchi ịhụnanya na eziokwu gị, 
nʼebe ọgbakọ ukwuu nọ. 
 11 O Onyenwe anyị, ezonarịla m ebere gị, 
ka ịhụnanya gị na eziokwu gị chebe m oge niile. 
 12 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu a na-apụghị ịgụta ọnụ gbara m gburugburu; 
mmehie m niile akarịala m, apụghịkwa m ịhụ ụzọ: 
ha karịrị agịrị isi dị m nʼisi, 
obi m na-adakwa mba nʼime m. 
 13 O Onyenwe anyị, ya masị gị ịzọpụta m; 
O Onyenwe anyị, bịa ngwangwa inyere m aka. 
 14 Ka ndị niile na-achọ ịnapụ m ndụ m, 
bụrụ ndị a ga-etinye nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara; 
ka ndị niile ọ na-amasị ịhụ ịla nʼiyi m, 
laghachi azụ nʼihere. 
 15 Ka ndị ahụ na-asị m, 
“Ehee! Ehee!” kụja nʼihi ihere onwe ha. 
 16 Ma ka ndị niile na-achọ gị 
ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime gị; 
ka ndị ahụ hụrụ nzọpụta gị nʼanya na-ekwu mgbe niile, 
“Onyenwe anyị dị ukwuu.” 
 17 Ma mụ onwe m bụ m ogbenye na onye nọ na mkpa; 
ka Onyenwe anyị cheta m. 
Ị bụ onye inyeaka m na onye mgbapụta m; 
Ị bụ Chineke m, anọla ọdụ ịbịa. 
*Abụ Ọma 40:4 40:4 Maọbụ, gbasoo okwu ụgha
†Abụ Ọma 40:6 40:6 1Sa 15:22; Abụ 51:16-17; Aịz 1:11; Jer 7:22-23; Mai 6:6-8; Hib 10:5-9