Abụ Ọma 29
Abụ Ọma Devid. 
Olu Onyenwe anyị 
 1 Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, 
nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 
 2 Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; 
kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 
 3 Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; 
olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, 
olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe* 29:3  Job 37:4-5; Abụ 18:13 nʼelu oke osimiri. 
 4 Olu Onyenwe anyị dị ike, 
olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 
 5 Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; 
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 
 6 Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, 
ọ na-eme ka Siriọn† 29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 wulie elu dịka nwa atụ. 
 7 Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe 
mgbe amụma na-egbu. 
 8 Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; 
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. 
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 
 10  Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; 
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 
 11  Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, 
ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya. 
*Abụ Ọma 29:3 29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13
†Abụ Ọma 29:6 29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6
‡Abụ Ọma 29:9 29:9 Ime na-eme nne ele