Abụ Ọma 30
Abụ Ọma. Abụ nke ido obieze Devid nsọ. 
Abụ mgbapụta 
 1 Aga m eto gị, O Onyenwe anyị, 
nʼihi na i sitere nʼebe dị omimi dọpụta m. 
I kweghị ka ndị iro m chịa m ọchị. 
 2 O Onyenwe anyị Chineke m, akpọkuru m gị, ka i nyere m aka, 
ị gwọkwara m. 
 3 O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, 
i mere ka m dịrị ndụ. 
 4 Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, unu ndị nsọ ya, 
toonu aha nsọ ya. 
 5 Iwe ya adịghị adịgide tee anya, 
ma ime amara ya na-adị ruo ebighị ebi! 
Ịkwa akwa nwere ike dịrị ogologo abalị niile, 
ma iti mkpu ọṅụ ga-adị nʼụtụtụ. 
 6 Mgbe m nọ nʼudo, asịrị m, 
“Ihe ọbụla apụghị ịnapụ m udo m.” 
 7 O Onyenwe anyị, mgbe i gosiri m ihuọma, 
i mere ka m kwụrụ chịm dịka ugwu; 
ma mgbe i zoro ihu gị site nʼebe m nọ, 
adara m mba. 
 8 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, ka m kpọkuru; 
ọ bụkwa onyenwe anyị ka m rịọrọ arịrịọ amara sị, 
 9 “Uru gịnị dị ma m laa nʼiyi? 
Uru gịnị dị ma m rịda nʼili? 
Uzuzu aja ọ ga-enye gị otuto? 
Ọ ga-ekwusa banyere ikwesi ntụkwasị obi gị?” 
 10 O Onyenwe anyị, gee m ntị ma meere m ebere; 
O Onyenwe anyị, bụụrụ m onye inyeaka. 
 11 I meela ka iti mkpu akwa m ghọọ ite egwu; 
ị napụrụ m akwa mkpe m, ma yinye m ọṅụ dịka akwa mmemme. 
 12 I mere nke a ka obi m bụọ maka otuto gị, ghara ịnọ nwayọọ. 
O Onyenwe anyị Chineke m, aga m eto gị ruo mgbe ebighị ebi.