Abụ Ọma 28
Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka enyemaka na-ekele 
 1 Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; 
gị bụ Oke nkume m, 
agbala m nkịtị. 
Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, 
aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu. 
 2 Nụrụ arịrịọ m maka ebere 
dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, 
mgbe m chịlịri aka m abụọ elu 
nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 
 3 Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, 
tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, 
ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, 
ma ha bu iro nʼime obi ha. 
 4 Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha 
na omume ha kwesiri; 
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, 
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa. 
 5 Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, 
ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, 
ọ ga-akwada ha nʼala, 
ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ. 
 6 Toonu Onyenwe anyị, 
nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere. 
 7  Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m; 
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka. 
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ, 
aga m ejikwa abụ m na-eto ya. 
 8  Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya, 
ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ. 
 9 Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;* 28:9 Maọbụ, ndị nke gị 
buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.