Abụ Ọma 27
Abụ Ọma Devid. 
Abụ nke iguzosi ike 
onye ka m ga-atụ egwu ya? 
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, 
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 
 2 Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha 
ka ha ripịa anụ ahụ m, 
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, 
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. 
 3 Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu, 
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla; 
ọ bụladị na agha adaa imegide m, 
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 
 4 Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị, 
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike; 
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị 
ụbọchị niile nke ndụ m, 
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị, 
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 
 5 Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, 
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; 
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; 
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 
 6 Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu 
karịa ndị iro m gbara m gburugburu; 
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; 
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 
 7 Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. 
Meere m ebere, zaa m. 
 8 Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” 
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 
 9 Ezonarịla m ihu gị, 
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; 
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. 
O Chineke, Onye nzọpụta m, 
ahapụkwala m. 
 10 Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, 
Onyenwe anyị ga-anabata m. 
 11 Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị; 
duo m nʼụzọ kwesiri 
nʼihi ndị na-akpagbu m. 
 12 Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha, 
ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m, 
ha na-ekupụ ihe ike dịka ume. 
 13 Olileanya m bụ nke a: 
Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị 
nʼala ndị dị ndụ. 
 14 Chere Onyenwe anyị; 
dịrị ike, nwekwaa ume, 
ma chere Onyenwe anyị.