Abụ Ọma 26
Abụ Ọma Devid. 
Ekpere nke ezi mmadụ 
 1  Onyenwe anyị, biko kpepụta m, 
nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;* 26:1  2Ez 20:2; Ilu 20:7 
atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, 
na-eleghị anya nʼazụ. 
 2 Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, 
nyochaa obi m na echiche m. 
 3 Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. 
Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. 
 4 Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. 
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 
 5 Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. 
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. 
 6 Ana m asacha aka† 26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13 m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, 
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị. 
 7 Ana m abụkwa abụ ekele, 
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. 
 8 O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, 
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya. 
 9 Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, 
ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara, 
 10 ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, 
aka nri ha jupụtakwara na ngarị. 
 11 Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; 
gbapụta m ma meere m ebere. 
 12 Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; 
aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ. 
*Abụ Ọma 26:1 26:1 2Ez 20:2; Ilu 20:7
†Abụ Ọma 26:6 26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13