Abụ Ọma 13
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 
Ekpere maka nnapụta 
 1 Ruo ole mgbe ka i ga-echefu m Onyenwe anyị? 
Ruo ole mgbe ka i ga-ezonarị m ihu gị?* 13:1  Job 13:24; Abụ 89:46 
 2 Ruo ole mgbe ka mụ na mmụọ m ga na-agba mgba 
nọdụkwa na-eru ụjụ kwa ụbọchị nʼime mkpụrụobi m? 
Ruo ole mgbe ka ndị iro m ga-anọgide na-emeri m? 
 3 Lekwasị m anya, ma zaa m, O Onyenwe anyị Chineke m. 
Nyeghachi m ìhè nke anya m ka m ghara ịnwụ; 
 4 mgbe ahụ onye iro m ga-asị, “Emeriela m ya,” 
mgbe m ga-ada, ndị kpọrọ m asị ga-aṅụrịkwa ọṅụ. 
 5 Ma atụkwasịrị m obi nʼịhụnanya gị nke na-enweghị ọgwụgwụ; 
mkpụrụobi m na-aṅụrị ọṅụ na nzọpụta gị. 
 6 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ, 
nʼihi na o mesoro m mmeso ọma.