Abụ Ọma 12
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma nke Devid. 
Ekpere maka enyemaka nʼoge ihe egwu 
 1  Onyenwe anyị, nyere anyị aka! Nʼihi na ndị ezi omume agwụla! 
Ndị kwesiri ntụkwasị obi anọkwaghị nʼetiti ụmụ mmadụ. 
 2 O nwekwaghị onye eziokwu dị nʼọnụ ya nye onye agbataobi ya. 
Egbugbere ọnụ onye ọbụla na-ekwukwa okwu ire ụtọ, 
maọbụ aghụghọ dị nʼobi ha. 
 3 Ka Onyenwe anyị wezuga egbugbere ọnụ niile na-ekwu okwu ire ụtọ 
na ire niile na-ekwu okwu ịnya isi. 
 4 Ndị na-asị, 
“Ọ bụ site nʼire anyị ka anyị ga-enwe mmeri; 
egbugbere ọnụ anyị ga-echebe anyị, ọ bụ onye na-achị anyị?” 
 5 “Nʼihi na a na-apụnara ndị ogbenye ihe nʼihi ndị nọ na mkpa na-asụ ude, 
aga m ebili ugbu a, ka Onyenwe anyị kwuru. 
Aga m zọpụta ha pụọ nʼaka ndị ahụ ji iwe ekwulu ha.” 
 6 Okwu ọnụ Onyenwe anyị niile zuruoke, 
ha dịka ọlaọcha a nụchara nʼọkụ, 
nke a nụchara ugboro asaa. 
 7 O Onyenwe anyị, i ga-edebe anyị nʼudo 
ma sitekwa nʼaka ndị dị otu a chebe anyị ruo mgbe ebighị ebi. 
 8 Ndị ajọ omume na-ejegharị nʼebe niile 
mgbe a na-eto ihe ọjọọ nʼetiti ụmụ mmadụ.