Abụ Ọma 14
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 
Ajọ omume nke ndị na-emebi iwu 
 1 Onye nzuzu na-asị* 14:1 Maọbụ, na-eche nʼime obi ya, 
“Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” 
Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; 
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 
 2  Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe 
na-ele ụmụ mmadụ anya 
ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta 
onye nke na-achọ Chineke. 
 3 Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; 
ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, 
ọ dịghị ọ bụladị, otu onye. 
 4 Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? 
Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, 
ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị. 
 5 Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, 
nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume. 
 6 Unu ndị ajọ omume na-emebi atụmatụ ndị ogbenye, 
ma Onyenwe anyị bụ ebe mgbaba ha. 
 7 A sịkwarị na nzọpụta Izrel ga-esi na Zayọn pụta! 
Mgbe Onyenwe anyị ga-akpọghachite ndị ya nʼọnọdụ ha, 
ka Jekọb ṅụrịa ọṅụ, ka Izrel nwekwaa obi ụtọ!