Abụ Ọma 11
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ọma Devid. 
Onyenwe anyị ebe mgbaba 
 1 Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. 
Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, 
“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” 
 2 Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; 
ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, 
zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, 
ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. 
 3 Mgbe a na-ebibi ntọala niile, 
gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? 
 4  Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; 
Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.* 11:4 Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị 
Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; 
anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 
 5  Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, 
ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, 
ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. 
 6 Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume 
dịka mmiri ozuzo; 
oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha. 
 7 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, 
ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; 
ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.