Abụ Ọma 10
Arịrịọ maka ikpe ziri ezi 
 1  Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? 
Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? 
 2 Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, 
ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. 
 3 Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, 
ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. 
 4 Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, 
nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. 
 5 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; 
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; 
ọ na-elelị ndị iro ya niile. 
 6 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. 
Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”* 10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, “Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m”; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, “Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ” 
 7 Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,† 10:7 Ya bụ, ịgba iyi 
nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. 
 8 Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, 
nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, 
na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. 
 9 Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, 
ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. 
Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye. 
 10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, 
ọ na-azọpịakwa ha. 
 11 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. 
O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”‡ 10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya 
 12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, 
echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. 
 13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? 
Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, 
“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? 
 14 Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, 
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. 
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, 
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. 
 15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, 
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile 
nke a na-apụghị ịchọpụta. 
 16  Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. 
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. 
 17 O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; 
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, 
 18 Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, 
ka mmadụ efu, onye e kere eke, 
ghara imenye ha egwu ọzọ. 
*Abụ Ọma 10:6 10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, “Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m”; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, “Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ”
†Abụ Ọma 10:7 10:7 Ya bụ, ịgba iyi
‡Abụ Ọma 10:11 10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya