Abụ Ọma 143
Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka enyemaka 
 1 O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m, 
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; 
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, 
bịa nyere m aka. 
 2 Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, 
nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị.* 143:2  Job 4:17; 9:2; Ekl 7:20 
 3 Onye iro na-achụ m ọsọ, 
ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; 
na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, 
dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga. 
 4 Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m 
ụjọ jupụtakwara m nʼobi. 
 5 Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; 
ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile 
na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ. 
 6 Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; 
agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. 
Sela
  7 O Onyenwe anyị, zaa m ọsịịsọ; 
mmụọ m na-ada mba. 
Ezonarịla m ihu gị, 
ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili. 
 8 Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, 
nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. 
Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, 
nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. 
 9 O Onyenwe anyị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, 
nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. 
 10 Kuziere m ime uche gị, 
nʼihi na ị bụ Chineke m; 
ka ezi Mmụọ gị 
duo m nʼala dị larịị. 
 11 O Onyenwe anyị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; 
nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. 
 12 Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; 
laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, 
nʼihi na abụ m ohu gị.