Abụ Ọma 142
Abụ maskil nke Devid. Mgbe ọ nọ nʼọgba nkume. Ekpere. 
Ekpere nke onye mkpọrọ 
 1 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa; 
ewelitara m olu m rịọ Onyenwe anyị ka o meere m ebere. 
 2 Ekwupụtara m ihe na-esogbu m nʼihu ya, 
gwakwa ya ahụhụ nke m nọ nʼime ya. 
 3 Mgbe mmụọ m dara mba nʼime m, 
ọ bụ gị maara ụzọ m. 
Nʼụzọ ebe m na-esi aga 
ka ndị mmadụ siiri m ọnya. 
 4 Lee anya nʼaka nri m ma hụ 
na ọ dịghị onye ọbụla na-eche ihe banyere m. 
Enweghị m ebe mgbaba. 
Ọ dịghị onye ọbụla ihe banyere m na-emetụta nʼobi. 
 5 Ana m etiku gị mkpu akwa, o Onyenwe anyị, 
na-asị, “Gị bụ ebe mgbaba m, 
oke m nʼala ndị dị ndụ.” 
 6 Gee ntị na mkpu akwa m, 
nʼihi na anọ m nʼọnọdụ ihe isiike; 
gbapụta m site nʼaka ndị na-achụ m ọsọ, 
nʼihi na ha siri ike karịa m. 
 7 Mee ka m nwere onwe m site nʼụlọ mkpọrọ, 
ka m nwee ike too aha gị. 
Mgbe ahụ ndị ezi omume ga-agba m gburugburu 
nʼihi ịdị mma gị nʼebe m nọ.