Abụ Ọma 144
Abụ Ọma nke Devid. 
Abụ nke dike nʼagha 
 1 Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, 
onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, 
na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 
 2 Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, 
ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, 
ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, 
onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 
gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi? 
 4 Mmadụ dị ka otu nkuume; 
ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo. 
 5 O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; 
metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 
 6 Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; 
gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha. 
 7 Site nʼelu setịpụ aka gị; 
gbapụta m, napụtakwa m 
site nʼoke osimiri, 
site nʼaka ndị si mba ọzọ, 
 8 ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, 
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 
 9 O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. 
Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; 
 10 gị onye na-enye ndị eze mmeri, 
onye na-agbapụta ohu ya Devid. 
Site na mma agha dị njọ  11 gbapụta m; 
napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ 
ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, 
ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 
 12 Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, 
ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, 
ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị 
e ji achọ ụlọeze mma. 
 13 Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri 
dị iche iche si nʼubi anyị. 
Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, 
ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị; 
 14 igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. 
A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, 
a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, 
akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile. 
 15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; 
ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.