Abụ Ọma 130
Abụ nrigo. 
Mkpụrụobi na-ele anya Chineke 
 1 O Onyenwe anyị, ọ bụ site nʼebe dị omimi ka m na-ebeku gị akwa. 
 2 Onyenwe anyị, nụrụ olu m. 
Ka ntị gị na-aṅakwa ntị 
nʼolu arịrịọ m, maka amara. 
 3 O Onyenwe anyị, a sị na i detuo mmehie niile, 
Onyenwe anyị, onye pụrụ iguzo? 
 4 Ma ọ bụ nʼaka gị ka mgbaghara mmehie* 130:4  Ọpụ 34:7; Neh 9:17; Dan 9:9 dị; 
ime ka anyị tụọ gị egwu, ma jeere gị ozi. 
 5 Ana m echere Onyenwe anyị, mkpụrụobi m na-echekwa ya, 
ọ bụ nʼokwu ya ka olileanya m dị. 
 6 Mkpụrụobi m na-echere Onyenwe anyị 
karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ, 
e, karịa ndị nche abalị na-echere chị ọbụbọ. 
 7 Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị, 
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide adịgide, 
nʼaka ya ka nzọpụta zuruoke dịkwa. 
 8 Ya onwe ya, ga-agbapụta Izrel 
site na mmehie ya niile.