Abụ Ọma 124
Abụ nrigo. Nke Devid. 
Ekele maka mgbapụta 
 1 A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, 
ka Izrel kwuo, 
 2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, 
mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị, 
 3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, 
ha gaara eloda anyị na ndụ; 
 4 idee mmiri gaara iri anyị, 
oke mmiri gaara ebufu anyị, 
 5 ebili mmiri niile 
gaara ebufu anyị. 
 6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị 
ka ha jiri eze ha dọrie anyị. 
 7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si 
gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; 
ọnya ahụ agbajiela, 
anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị. 
 8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, 
onye kere eluigwe na ụwa.