Abụ Ọma 120
Abụ nrigo. 
Ekpere maka nnapụta 
 1 Ana m akpọku Onyenwe anyị nʼime nsogbu m, 
ọ na-azakwa m. 
 2 O Onyenwe anyị, zọpụta m 
site nʼegbugbere ọnụ okwu ụgha 
na ire na-ekwu okwu aghụghọ. 
 3 Gịnị ka a ga-eme gị, 
ọ bụkwa gịnị ọzọ ka a gatụkwasịri gị, 
gị ire aghụghọ? 
 4 Ọ ga-eji àkụ dị nkọ nke dike nʼagha taa gị ahụhụ, 
ya na icheku ọkụ osisi brum na-ere ere. 
 5 Ahụhụ dịịrị m nʼihi na m bi na Meshek, 
nʼihi na m bikwa nʼetiti ụlọ ikwu ndị Keda! 
 6 Ogologo oge 
ka m binyere ndị kpọrọ udo asị. 
 7 Abụ m onye udo; 
ma mgbe m kwuru okwu, okwu ha bụ okwu agha.