Abụ Ọma 94
Chineke, onye ikpe nke mmadụ niile 
 1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-abọ ọbọ, 
o Chineke, onye na-abọ ọbọ, zipụta onwe gị. 
 2 Bilie, o Onye Ikpe nke ụwa; 
kwụghachi ndị nganga ụgwọ ọrụ ruuru ha. 
 3  Onyenwe anyị, ọ bụ ruo ole mgbe? 
Ọ bụ ruo ole mgbe ka ndị na-eme ajọ omume ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ? 
 4 Ha na-ekwuwapụ okwu mpako; 
ndị niile na-eme ajọ ihe jupụtara nʼitu ọnụ. 
 5 Ha na-azọpịa ndị gị, O Onyenwe anyị; 
ha na-emegbu ihe nketa gị. 
 6 Ha na-egbu ndị di ha nwụrụ na ndị ọbịa; 
ha na-egbu ndị na-enweghị nna. 
 7 Ha na-asị, “Onyenwe anyị anaghị ahụ ihe ndị a; 
Chineke Jekọb na-agba nkịtị.” 
 8 Lezienụ anya, unu ndị amamihe kọrọ nʼetiti ndị m; 
unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe? 
 9 Ọ pụtara na onye kpụrụ ntị anaghị anụ ihe? 
Ọ pụtara na onye kere anya anaghị ahụ ụzọ? 
 10 Ọ pụtara na onye na-adọ mba niile aka na ntị agaghị ata ha ahụhụ? 
Ọ pụtara na onye na-ezi mmadụ ihe enweghị ihe ọmụma? 
 11  Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ; 
ọ maara na ihe mmadụ na-eche nʼobi ya bụ naanị ihe na-enweghị isi. 
 12 Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye ị na-adọ aka na ntị, O Onyenwe anyị, 
onye ahụ ị na-akụziri ihe site nʼiwu gị; 
 13 ị na-enye ya izuike site nʼụbọchị nsogbu; 
tutu ruo mgbe a ga-egwuru ndị ajọ omume olulu. 
 14 Nʼihi na Onyenwe anyị agaghị ajụ ndị ya; 
ọ gaghị agbakụta ihe nketa ya azụ. 
 15 Ezi omume ga-abụ ntọala ikpe ikpe niile; 
ndị niile ndị ziri ezi nʼobi ga-agbasokwa ya. 
 16 Onye ga-ebiliri m imegide ndị ajọ omume? 
Onye ga-eguzo nʼọnọdụ m imegide ndị na-eme ajọ ihe? 
 17 A sị na Onyenwe anyị abịaghị nyere m aka, 
agaara m rịị abụ onye nwụrụ anwụ. 
 18 Mgbe m kwuru sị, “Ụkwụ m na-agbuchapụ,” 
ọ bụ ịhụnanya gị, O Onyenwe anyị, kwagidere m. 
 19 Mgbe oke nchekasị obi batara nʼime m, 
nkasiobi gị wetara mkpụrụobi m ọṅụ. 
 20 A ga-ejikọta gị na ocheeze ọchịchị ya rụrụ arụ, 
nke na-eweta mmekpa ahụ site nʼiwu ya? 
 21 Ndị ajọ omume na-ejikọta onwe ha imegide ndị ezi omume 
na-amakwa ndị aka ha dị ọcha ikpe ọnwụ. 
 22 Ma Onyenwe anyị a bụrụla ebe mgbaba e wusiri ike nye m, 
na Chineke m na oke nkume ebe m na-ezere ndụ. 
 23 Ọ ga-akwụghachi ha ụgwọ ọrụ kwesiri mmehie ha, 
lakwaa ha nʼiyi nʼihi ajọ omume ha; 
Onyenwe anyị Chineke anyị ga-ala ha nʼiyi.