Abụ Ọma 93
Ịdị ukwuu nke Onyenwe anyị 
 1  Onyenwe anyị bụ eze, ọ na-eyikwasị ịma mma dịka uwe; 
Onyenwe anyị na-eyikwasị ịma mma dịka uwe, ọ dịkwa ike nke ukwuu; 
nʼezie, ụwa niile na-eguzosikwa ike; apụghịkwa iwezuga ya nʼọnọdụ ya. 
 2 Ocheeze gị eguzosiela ike siterị na mgbe ochie; 
ị na-adịkwa site nʼebighị ebi ruo ebighị. 
 3 Oke osimiri niile amaliela elu, O Onyenwe anyị; 
oke osimiri niile eweliela olu ha elu; 
ebili mmiri niile nke oke osimiri na-amali elu na-eme mkpọtụ. 
 4  Onyenwe anyị onye nọ nʼelu, dị ukwuu 
karịa mkpọtụ nke oke osimiri niile na-eme, 
ma karịakwa ụda nke ebili mmiri nke oke osimiri. 
 5 Ụkpụrụ gị niile, Onyenwe anyị na-eguzosi ike; 
ịdị nsọ bụ ihe e ji chọọ ụlọ gị mma 
ruo ụbọchị na-enweghị ọgwụgwụ.