Abụ Ọma 95
Toonu Onyenwe anyị 
 1 Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ; 
ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ. 
 2 Ka anyị jiri ekele bịakwute ya 
jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma. 
 3 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu, 
eze ukwuu kachasị chi niile elu. 
 4 Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya, 
ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya. 
 5 Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha, 
aka ya kpụrụ ala akọrọ niile. 
 6 Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe, 
ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị; 
 7 nʼihi na ọ bụ Chineke anyị 
anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ, 
igwe atụrụ ọ na-elekọta anya. 
Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, 
 8 “Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba, 
maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara, 
 9 ebe nna nna unu ha nwara m, 
nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere. 
 10 Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ; 
ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ, 
ha amatabeghị ụzọ m niile.’ 
 11 Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị, 
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”